Saturday, August 8, 2015

Abu Otuto!!!!

Mo Nso ezi Onye ndu
Nano nso onye nke Kraist
Wer'aka-I dur'anyi nwayo
Nd'ije n'ala bu ohia
Nd'ike gwuru nanuri
Nanu ol'uto nke Gi
Si "Onye fur'uzo bia
Sorom, Agamedula i"

Enyi kasi mma no nso
Iyer'anya aka mgbe dum
Arapukwal'any n'egwu
Naso isi n'ochichi
Mgbe ok'ifufe nefe
Ike n'olil'anya agwu
Si "Onye fur'uzo bia
Sorom, Agamedula i"

Mgb'ubochi olu anyi gagwu
Mgbe anyi neche iz'ike
Mgbe ekpere na igwe
Nani ha foduru anyi
Mgb'anyi gaf'osimir'onwu
Natukwasi Kraist Obi
Si "Onye fur'uzo bia
Sorom, Agamedula i"

2 comments:

  1. Obu abu otito oma, kwesiri okwukwe

    ReplyDelete
  2. O buru na mu echeta ihe oma Chineke Nna na emere m
    Onu m agaghi akwusi ito Ya mgbe nile

    ReplyDelete