Wednesday, October 21, 2015

Benedictus: Luke 1. 68 - 79



Onye agoziri agozi ka O bu, bu Onye-nwe-anyi, Chineke nke Israel: n'ihi na O letawo ndi-Ya, lukwaraha olu ngbaputa

O weliwo-kwa-ra anyi npi nke nzoputa: n'ulo onye nejere Ya ozi bu Devid.

Dika O kwuru site n'onu ndi amuma Ya di nso; site n'oge mbu

Nzoputa n'aka ndi iro anyi: na n'aka ndi nile nakpo anyi asi

I mere nna anyi ha ebere: na icheta ogbugba ndu nso Ya

Iyi O nuru Abraham nna anyi: ikwe-nye anyi

Ebe adoputaworo anyi n'aka ndi iro anyi: ka anyi nekpere Ya n'atughi egwu; N'obi ocha n'ezi omume n'Iru Ya; ubochi anyi nile

Ozo kwa Gi onwe Gi, Nwatakiri. agakpo Gi Onye amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na I gaga n'Iru Onye-nwe-anyi i dozi uzo Ya nile

Ime ndi nke Ya ka ha mara nzoputa: nime ngbara nmehie nile ha

N'ihi Obi ebere nke Chineke anyi: nke owuwa anyanwu nke sitere n'elu geleta anyi nime ya

Imukwasi ndi no n'ochichiri na onyinyo onwu ihe: iduzi ukwu anyi ba n'uzo udo.

Otuto diri Nna, n'Okpara, na Mo Nso
Otu o diri na mbu, o di ugbu a
O gadigide otu a
we rue n'uwa ebighi ebi

Amen

0 comments:

Post a Comment